- Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 1 Timoti 1 Timoti 1 Timoti 1Tm 1 Timoti Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs site nʼiwu Chineke Onye nzọpụta anyị, na nke Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị, Na-edegara gị bụ Timoti ezi nwa m nʼime okwukwe akwụkwọ a. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. Ịdọ aka na ntị banyere ndị ozizi ụgha Dị ka m gbara gị ume, mgbe m na-aga Masidonia, nọgide nʼEfesọs ka i nwee ike nye mmadụ ụfọdụ iwu ka ha ghara ịga nʼihu nʼizi ụkpụrụ dị iche. Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nʼihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nʼokwukwe. Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị. Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru. Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike. Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee. Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha, na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ, nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe. Amara Onyenwe anyị nye Pọl Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi. Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe. Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs. Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. Imesi iwu e nyere Timoti ike Ugbu a, Timoti nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ. Jidesie okwukwe i nwere ike, ya na ezi akọnuche. Nʼihi na ụfọdụ ajụla ezi akọnuche ma si otu a dapụ nʼokwukwe. Haimeniọs na Alegzanda so na ndị a. Ewerela m ha nyefee Ekwensu nʼaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesighị ikwu okwu nkwulu megide Chineke. Iwu banyere Ofufe na Ekpere Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile, kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ. Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu. Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ. Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya. Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha. Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka. Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi. Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke. Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe. Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ. Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv. Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu. Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke. Ndị ndu chọọchị Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma. Ya mere onye ụkọchukwu3:2 Maọbụ, Onye nlekọta kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla. (Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?) Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu. Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu. Ndị na-eje ozi Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ,3:8 Ndị na-adịghị agha ụgha maọbụ ekwu okwu aghụghọ. ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi. Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị. Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile. Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma. Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs. Ihe omimi Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a. Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ. Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe. Ndụmọdụ e nyere Timoti Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ. Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha. Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha. Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya, nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ. Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro. Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke. Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu. Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe. Ndụmọdụ Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha. Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche. Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke. Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi. Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma. Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị. Ndị nwanyị di ha nwụrụ, ndị okenye na ndị ohu Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu. Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke. Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu. Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ. Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị. Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta. Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ. Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di. Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma. Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu. Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị. Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu. Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie. Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,”5:18 Dit 25:4 hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”5:18 Luk 10:7 Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya. Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha. Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu. Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha. Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe. Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ. Otu a kwa, ọrụ ọma na-apụta ihe, ma ọ bụladị ndị na-apụtaghị ihe, apụghị izo ha ezo. Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị. Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ndị ozizi ụgha na ịhụ ego nʼanya Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a. Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke, bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche, na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya. Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere. Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere. Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi. Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ6:10 Ya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ. Ndụmọdụ mmechi Pọl dụrụ Timoti Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ. Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe. Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe. Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen. Ndị ọgaranya Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ. Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere. Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru. Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma, bụ nke ụfọdụ kwupụtara, ma na ime nke a, ha esitela nʼụzọ okwukwe kpafuo. Ka amara dịnyere gị. Amen.